Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
a Oké ifufe mberede na-efekarị n’Oké Osimiri Galili. N’ihi otú ebe oké osimiri ahụ dị si dị ala (ihe ji ihe dị ka mita 200 dị ala karịa ọ̀tụ̀tụ̀ ịdị elu nke oké osimiri), ikuku dị n’ebe ahụ na-ekpo ọkụ karịa n’ebe ndị gbara ya gburugburu, nke a na-akpatakwa oké ifufe. Oké ifufe na-esi n’Ugwu Hemọn, nke dị n’ebe ugwu, na-efedasi ike na Ndagwurugwu Jọdan. Ihu igwe dị jụụ nwere ike ịgbanwe na mberede ghọọ oké ifufe.