Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
b Dị ka Mishnah si kwuo, mgbe afọ ole na ole gasịrị, e nwere mkpesa n’ihi ịdị oké ọnụ nke nduru a na-ere n’ụlọ nsọ ahụ. E ji ihe dị ka pasent 99 gbutuo ihe a na-ere ya ozugbo! Olee ndị ritere uru karịsịa n’azụmahịa a na-enye ego? Ụfọdụ ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme na-ekwu na ọ bụ ezinụlọ Nnukwu Onye Nchụàjà bụ́ Anas nwe ahịa ahụ a na-azụ n’ụlọ nsọ, na-ewetara ezinụlọ ahụ bụ́ ndị nchụàjà akụ̀ na ụba buru ibu.—Jọn 18:13.