Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
a Ndị odeakwụkwọ oge ochie, ma ọ bụ ndị Sopherim, gbanwere amaokwu a ka o kwuo na ọ bụ Jeremaịa na-ehulata, ọ bụghị Jehova. Ihe àmà na-egosi na ha chere na o kwesịghị ekwesị ịsị na Chineke mere ihe dị otú ahụ na-egosi ịdị umeala n’obi. N’ihi ya, ọtụtụ nsụgharị aghọtaghị isi ihe dị n’amaokwu a magburu onwe ya. Otú ọ dị, The New English Bible kwuru n’ụzọ ziri ezi na Jeremaịa na-agwa Chineke sị: “Cheta, biko cheta, ma hulatara m ala.”