Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
a Ugboro ugboro, Bible na-ejikọta olileanya mbilite n’ọnwu na ikike icheta ihe Jehova. Nwoke ahụ kwesịrị ntụkwasị obi bụ́ Job gwara Jehova, sị: “Ọ ga-adị m nnọọ mma . . . ma a sị na Ị kpaara m ókè, wee cheta m!” (Job 14:13, ọ bụ anyị dere okwu ahụ n’aka akwụkwọ dị iche.) Jizọs zoro aka ná mbilite n’ọnwụ nke “ndị nile nọ n’ili ncheta.” Nke a kwesịrị ekwesị n’ihi na Jehova na-echeta n’ụzọ zuru ezu ndị nile nwụrụ anwụ ọ na-ezube ịkpọlite n’ọnwụ.—Jọn 5:28, 29.