Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
a Akwụkwọ bụ́ Koran na-ezo aka n’ọmụmụ a mụrụ Jizọs n’ụzọ ọrụ ebube na Surah 19 (Meri). Ọ na-asị: “Anyị zigaara [Meri] mmụọ Anyị n’ọdịdị nwoke nke tojuru etoju. Mgbe ọ [Meri] hụkwara ya, ọ sịrị: ‘Ka Onye Ebere chebe m pụọ n’aka gị! Ọ bụrụ na ị na-atụ egwu Onyenwe anyị, hapụ m gawara onwe gị.’ ‘Abụ m onye ozi nke Onyenwe gị,’ ka ọ zaghachiri, ‘abịawokwa m inye gị nwa nwoke dị nsọ.’ ‘Olee otú m ga-esi mụọ nwa,’ ka ọ zaghachiri, ‘ebe m bụ nwanyị na-amaghị nwoke, nke nwoke ọ bụla na-akpatụbeghị aka?’ ‘Nke ahụ bụ uche Onyenwe gị,’ ka ọ zaghachiri. ‘Nke ahụ abụghịrị Ya ihe siri ike. “Ọ ga-abụrụ ihe a kpọrọ mmadụ ihe àmà,” ka Onyenwe anyị na-ekwu, “bụrụkwa ngọzi sitere n’Aka Anyị. Nke a bụ ihe Anyị kwubiworo.”’”