Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
a Ndị ọkà mmụta sayensị kwuru na anyị nwere ike inye ahụ́ anyị ọzụzụ, mụtakwa otú anyị ga-esi na-atụkwasị aka anyị na ụkwụ anyị n’ihe. Dị ka ihe atụ, ọ na-eme ka anyị nwee ike ịkụ aka ọbụna mgbe anyị mechiri anya. Otu nwaanyị ọrịa kụrụ gwoo gwoo enweghịzi ike iguzo ọtọ, ịga ije ma ọ bụ ịnọrọ ọdụ.