Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
a Ụfọdụ n’ime ndị ahụ na-emegide Stivin so n’òtù a na-akpọ “Ndị Nweere Onwe Ha.” O nwere ike ịbụ na ha bụ ndị ndị Rom jideburu n’agha ma mechaa hapụ, ma ọ bụkwanụ ha abụrụ ndị ohu nweere onwe ha, bụrụzie ndị mba ọzọ na-ekpe okpukpe ndị Juu. Ụfọdụ n’ime ha bụ ndị Silishia, bụ́ ebe Sọl onye Tasọs si. Baịbụl ekwughị ma Sọl ò so n’ụmụ nwoke ahụ na-enwelighị ike ịgbagha ihe Stivin na-ekwu.