Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
a Filip a abụghị Filip onyeozi. Kama, dị ka e kwuru n’Isi nke 5 n’akwụkwọ a, o so ‘n’ụmụ nwoke asaa ndị nwere aha ọma,’ ndị a họpụtara ka ha na-ahụ maka ikesara Ndị Kraịst bụ́ ụmụ nwaanyị di ha nwụrụ nọ na Jeruselem nri kwa ụbọchị, ma ndị nke na-asụ Grik ma ndị nke na-asụ Hibru.—Ọrụ 6:1-6.