Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
g Malite n’ebe a gawa, a kpọwara Sọl Pọl. Ụfọdụ ndị kwuru na ihe mere o ji zawa aha Rom bụ́ Pọl bụ iji kwanyere Sajiọs Pọlọs ùgwù. Ma, ebe ọ bụ na ọ ka nọ na-aza Pọl mgbe ọ hapụchara Saịprọs, ọ pụtara na e nwere ihe ọzọ kpatara ya. Ihe mere o ji kpebie ịzawa aha Rom ya bụ́ Pọl bụ na ọ bụ “onyeozi nke ndị mba ọzọ.” O nwere ike ịbụ na ihe ọzọ kpatara ya bụ na aha Hibru ya bụ́ Sọl na-ada ka otu okwu Grik nwere ihe na-adịghị mma ọ pụtara.—Rom 11:13.