e N’afọ 49 O.N.K., mgbe ndịozi na ndị okenye nọ na-ekwurịta ma ndị Jentaịl hà kwesịrị idebe Iwu Mosis, e kwuru na ụfọdụ Ndị Kraịst nọ ebe ahụ bụ “ndị nọbu n’òtù ndị Farisii, ndị ghọrọ ndị na-eso ụzọ Jizọs.” (Ọrụ 15:5) Ọ ga-abụ na a ka na-echeta na ha bụbu ndị Farisii.