Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
a Pọl chọburu ka ya na Onesịmọs nọrọ. Ma, ọ bụrụ na ya na ya anọrọ, ọ pụtara na ọ daala iwu ndị Rom, napụkwa nna ukwu Onesịmọs bụ́ Faịlimọn, onye bụ́ Onye Kraịst, ihe ruuru ya. N’ihi ya, Onesịmọs laghachikwuuru Faịlimọn. Mgbe ọ na-ala, Pọl nyere ya akwụkwọ ozi o ji gwa Faịlimọn ka ọ nabata ya nke ọma ka nwanna.—Faị. 13-19.