Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
c Baịbụl kwuru otú ha si lelịa àjà a na-achụrụ Chineke. Nke mbụ bụ na iwu Chineke nyere ndị Izrel kwuru ebe ndị nchụàjà ga-ewere n’anụ ndị e ji chụọ àjà. (Diut. 18:3) Ma, ndị nchụàjà ọjọọ ahụ bịaziri na-eme ihe dị iche n’ụlọikwuu ahụ. Ha na-edunye ndị na-ejere ha ozi ka ha dụnye nnukwu ndụdụ n’ite mgbe a ka na-esi anụ esi, na-ewere anụ ọ bụla dị mma ndụdụ ahụ dụtara. Nke abụọ bụ na mgbe ndị mmadụ wetara àjà ka a chụọrọ ha n’ebe ịchụàjà, ndị nchụàjà ọjọọ ahụ na-edunye onye na-ejere ha ozi ka ọ majaa onye a ga-achụrụ àjà ahụ ma gwa ya ka o nye ya anụ ndụ tupu a chụọrọ Jehova abụba anụ ahụ n’àjà.—Lev. 3:3-5; 1 Sam. 2:13-17.