Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
a O nwere ike ịbụ mmụọ ozi ahụ nke e kwuru ná 1 Ndị Eze 19:9 na “okwu Jehova” si n’ọnụ ya ruo Ịlaịja ntị, nwe ‘olu ahụ dị ala, nke dịkwa nwayọọ.’ N’amaokwu nke 15, a kpọrọ mmụọ ahụ “Jehova.” Nke a na-echetara anyị mmụọ ozi Jehova ji duo ndị Izrel mgbe ha nọ n’ala ịkpa. Chineke kwuru banyere mmụọ ozi ahụ, sị: “Aha m dị n’ime ya.” (Ọpụ. 23:21) Anyị agaghị asị na ọ ga-abụrịrị Jizọs nwe olu ahụ. Ma, ọ dị mma icheta na ọ bụ Jizọs bụ “Okwu ahụ” tupu ya abịa n’ụwa. Nke a pụtara na ọ bụ ya bụ Ọnụ Na-ekwuchitere Chineke, onye Jehova si n’aka ya zie ndị na-efe ya ozi.—Jọn 1:1.