Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
c N’asụsụ Grik, ihe a na-akpọ okwu Hibru a sụgharịrị “azụ̀” bụ “nnukwu anụ mmiri” ma ọ bụ “azụ̀ buru ibu.” Ọ bụ eziokwu na e nweghị otú a ga-esi amata ụdị anụ mmiri loro Jona, a chọpụtala na n’Oké Osimiri Mediterenian, e nwere azụ̀ shak ndị buru oké ibu nke na ha nwere ike ilo mmadụ. E nwekwara azụ̀ shak ndị ka ndị nke ahụ n’ebe ndị ọzọ. Azụ̀ shak a na-akpọ weel nwere ike iru mita iri na ise n’ogologo ma ọ bụkwanụ karịa.