Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
a Eze nyedịrị ndị Juu ikike ka ha lụkwuo agha otu ụbọchị ọzọ ka ha nwee ike gbuchaa ndị iro ha. (Esta 9:12-14) Ruo taa, ndị Juu ka na-echeta mmeri ahụ ha meriri ndị iro ha. Ha na-echeta ya n’afọ ọ bụla n’ọnwa ndị Juu na-akpọ Eda. Ememme a na-adaba ná ngwụcha ọnwa Febụwarị ma ọ bụ ná mmalite ọnwa Mach na kalenda oge a. Ha na-akpọkwa ememme ha ji echeta ya Purim. Ebe e si nweta okwu ahụ bụ́ Purim bụ na nza ahụ a na-akpọ Pua nke Heman fere mgbe ọ na-akpa nkata igbu ndị Izrel.