Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
b Ọ bụ eziokwu na e nwere ike ikwu taa na puku afọ abụọ abụghị obere ihe, anyị ekwesịghị ichefu na ụmụ mmadụ na-adịte ndụ aka n’oge ahụ karịa anyị. Si n’oge Adam dịrị ndụ ruo n’oge Ebreham dịrị ndụ, e nwere naanị ọgbọ anọ. Adam na Lemek nna Noa, dịkọrọ ndụ. Lemek na Shem, nwa Noa, dịkọkwara ndụ. Shem na Ebreham dịkọkwara ndụ.—Jen. 5:5, 31; 9:29; 11:10, 11; 25:7.