Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
c E nwere ebe iri na asatọ n’Akwụkwọ Nsọ Hibru a kpọrọ Setan aha. Ma, okwu bụ́ “Setan” gbara ihe karịrị ugboro iri atọ n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst. Ọ dị mma na e kwuru ọtụtụ ihe n’Akwụkwọ Nsọ Hibru gbasara otú a ga-esi amata onye Mesaya bụ, ma kwuo ihe ole na ole gbasara Setan. Mgbe Mesaya bịara n’ụwa, ọ kọọrọ anyị onye Setan bụ. E dere ihe ndị Mesaya ahụ kwuru gbasara Setan n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst.