Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
d Ihe atụ ọzọ Jizọs mere bụ gbasara onye ahịa nke na-achọ nkume pel ọma. Mgbe onye ahịa ahụ chọtara ya, o rere ihe niile o nwere zụta ya. (Mat. 13:45, 46) Ihe atụ abụọ ahụ na-akụziri anyị na anyị nwere ike isi ụzọ dị iche iche mụta eziokwu gbasara Alaeze Chineke. O nwere ndị e nwere ike ịsị na ha achọghị ya achọ hụ ya, nweekwa ndị chọrọ ya achọ tupu ha achọta ya. Ma, n’agbanyeghị otú anyị si mụta eziokwu a, anyị niile dị njikere ịhapụ ihe ụfọdụ anyị na-eme ka anyị nwee ike ibu ụzọ na-achọ Alaeze Chineke.