Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
a Baịbụl kwuru na a ga-esi n’ebe a dọọrọ ndị Chineke n’agha kpọghachi ha n’obodo ha. N’afọ 1932, a kọwara na n’oge anyị a, amụma a emezughị n’isi ụmụ Izrel nkịtị, kama, o mezuru n’isi Izrel nke Chineke. Ọ na-ekwu gbasara ịmaliteghachi ife Jehova otú ọ chọrọ n’oge anyị a. Ọ bụ ná nkebi nke abụọ nke akwụkwọ anyị a na-akpọ Vindication ka e buru ụzọ kọwaa ihe a. N’Ụlọ Nche March 1, 1999, a kọwara na ụlọ nsọ ahụ Ezikiel hụrụ n’ọhụụ a gbasara ịmaliteghachi ife Jehova otú ọ chọrọ. N’ihi ya, amụma a na-emezukwa n’oge ikpeazụ a.