Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
a Olee otú anyị si mara na Chineke kụziiri Ọkpara ya otú ọ ga-esi akụziri ndị mmadụ ihe? Chebara ihe a echiche: Jizọs ji ọtụtụ ihe atụ kụzie ihe. E buru amụma ọtụtụ narị afọ tupu a mụọ ya na ọ ga-eme ihe a. (Ọma 78:2; Mat. 13:34, 35) O doro anya na Jehova, bụ́ onye amụma ahụ si n’aka, kwuru ọtụtụ narị afọ tupu a mụọ Ọkpara ya na Ọkpara ya ga-eji ihe atụ ma ọ bụ ilu kụziere ndị mmadụ ihe.—2 Tim. 3:16, 17.