Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
a Ọ ga-abụ na a mụrụ Ebel obere oge a chụpụchara Adam na Iv n’ogige Iden. (Jen. 4:1, 2) Jenesis 4:25 kwuru na Chineke nyere Iv Set ka ọ ‘nọchie Ebel.’ Ọ bụ mgbe Ebel nwụchara ọnwụ ike ka a mụrụ Set. Adam dị otu narị afọ na iri atọ (130) mgbe ahụ. (Jen. 5:3) N’ihi ya, ọ ga-abụ na Ebel dị ihe dị ka otu narị afọ (100) mgbe Ken gburu ya.