Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
e Ọ ga-abụ na Ezikiel dị afọ iri atọ mgbe ọ malitere ibu amụma n’afọ 613 T.O.N.K. N’ihi ya, o nwere ike ịbụ na a mụrụ ya n’ihe dị ka afọ 643 T.O.N.K. (Ezik. 1:1) Ọ bụ n’afọ 659 T.O.N.K. ka Josaya malitere ịchị. A chọtakwara akwụkwọ e dere Iwu Mosis n’afọ nke iri na asatọ n’ọchịchị Josaya ma ọ bụkwanụ n’agbata afọ 642 na 641 T.O.N.K. O nwere ike ịbụ akwụkwọ iwu nke Mosis ji aka ya dee ka a chọtara n’oge ahụ.