Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
a Okwu Grik e jiri mee ihe n’ebe a, bụ́ an·tiʹly·tron, apụtaghị ebe ọ bụla ọzọ n’ime Bible. E nwere njikọ dị n’etiti ya na okwu ahụ Jisọs jiri mee ihe maka ihe mgbapụta (lyʹtron) na Mak 10:45. Otú ọ dị, Akwụkwọ The New International Dictionary of New Testament Theology na-eme ka ọ pụta ìhè na an·tiʹly·tron ‘mesiri ike echiche nke ime mgbanwerịta.’ N’ụzọ kwesịrị nnọọ ekwesị, nsụgharị New World Translation dere ya “ihe mgbapụta ruru eru.”