Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
a Tụlee ụzọ abụọ Pọl si mee omume n’okwu metụtara obibi úgwù. Ọ bụ ezie na ọ maara na “obibi úgwù abụghị ihe,” o biri onye ahụ ya na ya so ejegharị, bụ́ Timoti, úgwù, onye bụ onye Juu site ná nne ya. (1 Ndị Kọrint 7:19; Ọrụ 16:3) N’okwu banyere Taịtọs, Pọl zeere ime ka e bie ya úgwù dị ka okwu metụtara ụkpụrụ ná nrụrịta ụka ya na ndị okpukpe ndị Juu. (Ndị Galetia 2:3) Taịtọs bụ onye Grik, n’ihi nke a kwa, n’adịghị ka Timoti, o nweghị ezi ihe ọ bụla mere ọ ga-eji bie úgwù. Ọ bụrụ na a ga-ebi ya, bụ́ onye Jentaịl, úgwù, ‘Kraịst agaghị abara ya uru ọ bụla.’—Ndị Galetia 5:2-4.