Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
b Novatian na-ezo aka n’eziokwu ahụ bụ na okwu e ji eme ihe maka “otu” nke dị n’amaokwu nke a bụ nke na-egosi ihe nkịtị. Ya mere, ihe ọ na-apụtakarị bụ “otu ihe.” Tụlee Jọn 17:21, ebe e ji okwu Grik maka “otu” mee ihe kpọmkwem n’otu ụzọ ahụ. N’ụzọ na-adọrọ mmasị, akwụkwọ New Catholic Encyclopedia (mbipụta 1967) n’ozuzu ya na-akwado De Trinitate nke Novatian, ọ bụ ezie na ọ rịbara ama na n’ime ya “e leghị Mmụọ Nsọ anya dị ka Onye bụ chi.”