Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
a Ọ bụ ezie na Bible na-asị na “mkpụrụ ọ bụla mmadụ na-agha, nke ahụ ka ọ ga-ewetakwa n’ubi,” nke a apụtaghị na ahụhụ mmadụ na-ata aghaghị ịbụ nkwụghachi ụgwọ sitere n’aka Chineke. (Ndị Galetia 6:7) N’ime ụwa a Setan na-achị, ndị ezi omume na-echekarị ọtụtụ nsogbu ihu karịa ndị ajọ omume. (1 Jọn 5:19) “Mmadụ nile ga-akpọkwa unu asị n’ihi aha m,” ka Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ ya. (Matiu 10:22) Ọrịa na ọdachi ndị ọzọ pụrụ ịdakwasị otu n’ime ndị ohu Chineke ọ bụla na-ekwesị ntụkwasị obi.—Abụ Ọma 41:3; 73:3-5; Ndị Filipaị 2:25-27.