Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
a Site n’ihe ọmụmụ ya nke ógbè ahụ, onye ọkà n’ihe banyere ọrụ ugbo bụ́ Walter C. Lowdermilk (nke na-anọchite anya Òtù Nri na Ọrụ Ugbo nke U.N.) kwubiri, sị: “Ala a bụbu paradaịs anụ na-ata nri.” O gosikwara na ihu igwe ebe ahụ agbanwebeghị nke ukwuu “eri oge ndị Rom,” nakwa na “‘ọzara’ ahụ weghaara ala ahụ na-emebu ihe nke ọma bụ ọrụ aka mmadụ, ọ bụghị nke okike.”