Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
a “Ịlọ ụwa,” ka The New Encyclopædia Britannica na-ekwu, pụtara “mmụghachi nke mkpụrụ obi n’otu ịdị adị ma ọ bụ karị sochiri ibe ya, nke pụrụ ịbụ mmadụ, anụmanụ, ma ọ bụ, n’ọnọdụ ụfọdụ, ihe ọkụkụ.” E jikwa okwu ahụ bụ́ “mmụghachi” eme ihe iji kọwaa ihe omume a, ma a na-anakwere okwu ahụ bụ́ “ịlọ ụwa” karị. Ọtụtụ akwụkwọ ọkọwa okwu n’asụsụ India ji okwu ndị ahụ eme ihe n’ụzọ mgbanwerịta.