Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
a Ọ bụ ezie na Pọl ‘nyere iwu,’ nke a apụtaghị na ọ na-achọ ihe otú o si masị ya, ná mmanye. Kama nke ahụ, Pọl na-elekọta nanị onyinye ahụ, bụ́ nke metụtara ọgbakọ dị iche iche. Tụkwasị na nke a, Pọl sịrị na onye ọ bụla “n’ụlọ [nke aka ya, NW]” ga-enye “otú ihe na-agara onye ọ bụla nke ọma.” N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, a ga-enye onyinye nke ọ bụla ná nzuzo nakwa n’ụzọ afọ ofufo. Ọ dịghị onye a manyere amanye.