Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
a Ụlọ Ọrụ Ihe Ọmụma Ụlọ Ọgwụ na-elekọta njikọ zuru ụwa ọnụ nke Kọmitii Mmekọrịta Ụlọ Ọgwụ. N’aka nke ha, ndị mejupụtara kọmitii a bụ ndị Kraịst na-arụ ọrụ afọ ofufo bụ́ ndị a zụrụ ịkwalite nkwekọrịta n’etiti ndị dọkịta na ndị ọrịa ha bụ́ Ndịàmà. E nwere ihe karịrị Kọmitii Mmekọrịta Ụlọ Ọgwụ 1,400 bụ́ ndị na-enyere ndị ọrịa aka n’ihe karịrị ala 200.