Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
a Nnukwu mgbidi e ji nkume wuo, nke dị kubit atọ n’ịdị elu, kewapụrụ Ogige Ndị Jentaịl pụọ n’ogige dị n’ime nke ụlọ nsọ ahụ. E degasịrị okwu ịdọ aka ná ntị n’ahụ mgbidi ahụ, ụfọdụ n’asụsụ Grik, ụfọdụkwa n’asụsụ Latin: “Ka onye ọ bụla bụ́ onye ala ọzọ ghara ịbanye n’ime ihe mgbochi a na mgbidi gbachibidoro ebe nsọ a. Ọnwụ onye ọ bụla e jidere bụ́ nke ga-esochi, ga-adị ya n’isi.”