Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
a Dị ka akwụkwọ bụ́ The Catholic Encyclopedia, si kwuo, n’oge Ndozigharị ahụ, ụkpụrụ nduzi bụ́: Cuius regio, illius et religio (N’ụzọ bụ́ isi, nke a pụtara: “Onye ọ bụla na-achị ala na-ekpebikwa okpukpe a ga na-ekpe na ya.”) gosipụtara mmanye a manyere ndị mmadụ ikpe otu okpukpe.