Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
a Eleghị anya e degaara ndị Hibru akwụkwọ ozi ahụ na 61 O.A. Ọ bụrụ otú ahụ, ọ bụ mgbe nanị ihe dị ka afọ ise gasịrị ka usuu ndị agha Cestius Gallus gbara Jeruselem gburugburu. N’oge na-adịghị anya, usuu ndị agha ahụ pụrụ, na-enye Ndị Kraịst mụ anya ohere ịgbalaga. Afọ anọ ka e mesịrị, usuu ndị agha Rom nọ n’okpuru Ọchịagha Titus bibiri obodo ahụ.