Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
a Mgbe Pita gara Antiọk nke Siria, o soro ndị kwere ekwe bụ́ ndị Jentaịl nwee mkpakọrịta na-ekpo ọkụ. Otú ọ dị, mgbe ndị Juu bụ́ Ndị Kraịst si Jeruselem bịa, Pita “wezụgara ma kewapụ onwe ya, n’ihi egwu nke ndị ahụ e biri úgwù.” Anyị pụrụ iji anya nke uche hụ otú nke ahụ na-aghaghị isiwo wute ndị ahụ kwere ekwe bụ́ ndị Jentaịl mgbe onyeozi a a na-akwanyere ùgwù jụrụ iso ha rie ihe.—Ndị Galeshia 2:11-13.