Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
a N’Akwụkwọ Nsọ, okwu ahụ bụ́ “ịkpọasị” nwere ihe ndị dịtụgasị iche ọ pụtara. N’ebe ụfọdụ, ọ na-apụta nanị ịhụ n’anya n’ụzọ dị nta karị. (Deuterọnọmi 21:15, 16) “Ịkpọasị” pụkwara ịpụta enweghị nnọọ mmasị n’ihe ma ọ bụ onye ma n’ebughị n’obi imebi ihe ahụ ma ọ bụ imerụ onye ahụ ahụ́, kama nke ahụ, na-achọ ụzọ isi zere ya n’ihi oyi a na-asọ ya. Otú ọ dị, okwu ahụ bụ́ “ịkpọasị” pụkwara ịpụta oké ibu iro, ibu iro ruo ogologo oge bụ́ nke obi ilu na-esokarị. Ọ bụ nkọwa a nke okwu ahụ ka a tụlere n’isiokwu a.