Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
a Okwu ndị e hotara na paragraf a nakwa ná ndị na-eso ya na-egosi omenala ndị e nwere n’ala ụfọdụ bụ́ ebe ndị a na-atụ anya ka ezinụlọ nke nwanyị a na-alụ ọhụrụ kwụọ ezinụlọ nke nwoke na-alụ nwunye ọhụrụ ụgwọ isi ma ọ bụ nye ha onyinye. N’ọtụtụ omenala ndị Africa, ọ bụ nwoke ahụ ma ọ bụ ezinụlọ ya ka a na-atụ anya ka ha kwụọ ezinụlọ nke nwanyị a na-alụ ọhụrụ ụgwọ isi ma nye ha onyinye. Otú ọ dị, ụkpụrụ ndị e setịpụrụ ebe a na-emetụtacha ọnọdụ abụọ ahụ.