Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
a Okwu ndị ahụ pụrụ izo aka n’ọrụ onyeisi nke ugwu ụlọ nsọ dị na Jeruselem. N’oge nche abalị, ọ na-agagharị n’ụlọ nsọ iji hụ ma ndị Livaị na-eche nche hà mụ anya ka hà na-ehi ụra n’ebe ha na-eche nche. A na-apịa onye nche ọ bụla a hụrụ ka ọ na-ehi ụra ihe, a pụkwara ịgba uwe elu ya ọkụ dị ka ntaramahụhụ iji menye ya ihere.