Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
a Tupu a gbanwee ọchịchị n’October 1917, Russia nọ na-eji kalenda Julian merela ochie agụ oge, ma ihe ka ọtụtụ ná mba ndị ọzọ gbanwere ma na-ejizi kalenda Gregory. Na 1917, kalenda Gregory jiri ụbọchị 13 karịa nke Julian. Mgbe a gbanwesịrị ọchịchị, ndị Soviet maliteziri iji kalenda Gregory agụ oge, nke ahụ meziri ka Russia na mba ndị ọzọ na-ejizi otu kalenda agụ oge. Otú ọ dị, Chọọchị Ọtọdọks akwụsịghị iji kalenda Julian eme ihe maka ememe ya, ha kpọrọ ya kalenda “Ochie.” Ị pụrụ ịnụ na a na-agba Krismas na Russia na January 7. Otú ọ dị, cheta na January 7 na kalenda Gregory bụ December 25 na kalenda Julian. Ya mere, ọtụtụ ndị Russia na-esi otú a ahazi oge ezumike ha: December 25, Krismas Ebe Ọdịda Anyanwụ; January 1, Afọ Ọhụrụ ndị ọrụ; January 7, Krismas ndị Ọtọdọks; January 14, Afọ Ọhụrụ Oge Ochie.