Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
a Ma ọ dịghị ihe ọzọ, Jonatan eruola iri afọ abụọ mgbe mbụ a kpọtụrụ ya aha dị ka onyeisi agha ná mmalite nke ọchịchị Sọl dịruru iri afọ anọ. (Ọnụ Ọgụgụ 1:3; 1 Samuel 13:2) N’ihi ya, ọ ghaghị ịbụ na Jonatan eruwela iri afọ isii mgbe ọ nwụrụ n’ihe dị ka afọ 1078 T.O.A. Ebe ọ bụ na Devid dị iri afọ atọ mgbe ahụ, ọ dị ka Jonatan ò ji ihe dị ka iri afọ atọ tọọ Devid.—1 Samuel 31:2; 2 Samuel 5:4.