Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
a Akwụkwọ Nsọ ji “ìhè” mee ihe ọtụtụ ugboro n’ụzọ ihe atụ. Dị ka ihe atụ, Bible kwuru na Chineke bụ ìhè. (Abụ Ọma 104:1, 2; 1 Jọn 1:5) E ji ihe ọmụma sitere n’Okwu Chineke tụnyere ìhè. (Aịsaịa 2:3-5; 2 Ndị Kọrint 4:6) Mgbe Jizọs na-eje ozi n’elu ala, ọ bụ ìhè. (Jọn 8:12; 9:5; 12:35) E nyere ụmụazụ Jizọs iwu ka ha kwe ka ìhè ha na-enwu.—Matiu 5:14, 16.