Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
a Otú ahụ a na-ekpe n’ekpere ahụ Jizọs kụziri, ya bụ, ka e doo aha Chineke nsọ, ọ bụkwa otú ahụ ka a na-ekpe n’ekpere ahụ ndị okpukpe ndị Juu na-ekpe ma ha na-eru uju. Ọ bụ ezie na ụfọdụ ndị na-arụ ụka ma ekpere ahụ ndị okpukpe ndị Juu na-ekpe ọ̀ malitere n’oge Kraịst nọ n’ụwa ma ọ̀ bụ tupu ya abịa n’ụwa, o kwesịghị iju anyị anya na ekpere abụọ ahụ yitewere. Mgbe Jizọs kụziiri ha ekpere ahụ, ihe o bu n’obi abụghị ịkụzi ihe ha na-anụtụbeghị ma ọ bụ ịgbanwe ihe ha ma. Ihe niile o kwuru n’ekpere ahụ hiwechara isi n’Akwụkwọ Nsọ ndị Juu niile nwere n’oge ahụ. Ihe Jizọs gbara ndị Juu ibe ya ume ka ha na-eme bụ ikpe ekpere maka ihe ndị ha kwesịrị ịdị na-ekpe n’ekpere.