Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
a E nweghị otu mkpụrụ okwu nke a pụrụ iji sụgharịa nnọọ kpọmkwem okwu Pọl onyeozi ji mee ihe n’ebe a. Otu akwụkwọ kwuru, sị: “Otu n’ime ihe ọ pụtara bụ mmadụ ịghara isi ọnwụ inweta ihe ruuru ya, ọ pụtakwara mmadụ ichebara ndị ọzọ echiche nakwa iji obiọma na-emeso ndị ọzọ ihe.” Ya mere, otu ihe okwu ahụ pụtara bụ mmadụ ikwenye ekwenye na inwe ezi uche, mmadụ ịghara isi ọnwụ ịhụ na e mezuru ihe niile e dere n’iwu ma ọ bụ na-achọ mgbe niile ka e mee ihe otú o si chọọ.