Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
a Iri oké nri bụ àgwà na-eri mmadụ isi, na-eme ka onye ahụ jiri anyaukwu na-eri ihe ma ọ bụ na-eribiga ya ókè. N’ihi ya, anaghị esi n’otú mmadụ ha ama na onye ahụ na-eribiga nri ókè, kama a na-esi n’otú onye ahụ si eme mgbe ọ hụrụ nri. Mmadụ nwere ike o bughị ibu, ma ọ bụdị dị kịrịkịrị, ma ya abụrụ onye na-eribiga nri ókè. N’aka nke ọzọ, ihe ndị nwere ike ịkpatara mmadụ ibu oké ibu bụ ọrịa ma ọ bụ ya abụrụ na o si ya n’agbụrụ. N’agbanyeghị otú mmadụ há, ihe bụ́ isi bụ ma onye ahụ ọ̀ dị anyaukwu gabiga ókè mgbe a bịara n’iri nri.—Lee “Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ” n’Ụlọ Nche nke November 1, 2004.