Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
a Mgbe ndị Farisii na-ekwu banyere Jizọs, o nwere ihe ha ji nganga kwuo banyere Galili nke anyị kwesịrị ilebara anya, n’ihi na ọ bụ n’obodo dị na Galili ka a mụrụ Jona. Ha sịrị: “Chọọ n’Akwụkwọ Nsọ, ị ga-ahụ na ọ dịghị onye amụma ga-esi na Galili.” (Jọn 7:52) Ọtụtụ ndị nsụgharị na ndị na-eme nnyocha kwuru na ọ ga-abụ na ndị Farisii ahụ na-ekwu ihe na-edoghị ha anya, ya bụ, na e nwetụbeghị onye amụma si n’obodo Galili ahụ a na-eleda anya ma ọ bụ na e nweghị mgbe a ga-enwe onye amụma ga-esi na ya. Ya bụrụ otú ahụ, ihe ọ pụtara bụ na ndị Farisii ahụ na-eleghara ma akụkọ ihe mere eme ma amụma e buru ebu anya.—Aịzaya 9:1, 2.