Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
a Mgbe ụmụ Izrel pụsịrị n’Ijipt, ha dị njikere ịbanye n’ala Kenan, bụ́ ala Chineke kwere Ebreham ná nkwa. Ma, mgbe ndị nledo iri weghachiri ozi ọjọọ, ụmụ Izrel tamuru ntamu megide Mozis. N’ihi ya, Jehova kpebiri na ha ga-anọ n’ala ịkpa ahụ iri afọ anọ, bụ́ oge ọ ga-ewe ọgbọ nnupụisi ahụ ịnwụcha.