Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
a Mgbe e dere Baịbụl, aha ahụ bụ́ Jehova pụtara ihe dị ka puku ugboro asaa n’ime ya. Ihe aha ahụ pụtara bụ “M ga-abụ ihe m chọrọ ịbụ.” (Ọpụpụ 3:14) Chineke nwere ike ịbụ ihe ọ bụla o chere dị mkpa iji mezuo nzube ya. N’ihi ya, aha a na-eme ka obi sie anyị ike na Chineke agatụghị eme ihe megidere ihe o kwuru nakwa na ihe ọ bụla o kwere ná nkwa ga-emezu.