Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
a Ụbọchị a nwere ike ịdị iche n’ụbọchị ndị Juu nke oge a ji eme Ememme Ngabiga ha. Maka gịnị? Ihe ka ọtụtụ ná ndị Juu nke oge a na-eme Ememme Ngabiga na Naịsan 15, n’ihi na ha chere na iwu ahụ e nyere n’Ọpụpụ 12:6 na-ekwu ka e mee ya n’ụbọchị ahụ. (Gụọ Ụlọ Nche February 15, 1990, peeji nke 14.) Ma, Jizọs mere ememme ahụ na Naịsan 14 dị ka e kwuru n’Iwu Mozis. Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu banyere otú e si agbakọta ụbọchị a, gụọ Ụlọ Nche December 15, 1977, peeji nke 767.