Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
c Heman kwuru na ya ga-enye eze iri puku talent ọlaọcha, nke bụ́ ọtụtụ nde dọla n’oge a. Ọ bụrụ na ọ bụ Ahazuirọs bụ Xerxes nke Mbụ, ọ ga-abụ ego ole ahụ Heman kwuru na ya ga-enye ya mere o ji nwekwuo mmasị n’ihe ahụ Heman chọrọ ime. Xerxes mefuru ego buru ibu n’agha ọ lụsoro ndị Gris, ndị Gris merikwara ya n’agha ahụ. O nwere ike ịbụ na a lụrụ agha ahụ tupu ya alụọ Esta.