Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
a Aha Ebreham na-azabu bụ Ebram, nwunye ya na-azabukwa Seraị. Chineke mechara gụgharịa ya Ebreham, nke pụtara “Nna nke Ìgwè Mba Dị Iche Iche,” gụgharịakwa nwunye ya Sera, nke pụtara “Nne Ndị Eze.” (Jenesis 17:5, 15) N’isiokwu a na n’isiokwu ndị na-esonụ, anyị ga-akpọ ha Ebreham na Sera.