Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
c Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na gị na onye ahụ gị na ya kwara iko na-arụ ọrụ otu ebe, ma gị achọpụta na ọ gaghị adịcha mfe ka gị na ya kwụsị imekọ ihe ụfọdụ, kwe ka ọ bụrụ naanị ihe ndị dị mkpa ka gị na ya ga na-emekọ. Ihe ọ bụla gị na ya ga-emekọ kwesịrị ịbụ n’ihu ndị ọzọ, i kwesịkwara ime ka di gị ma ọ bụ nwunye gị mara ihe niile na-aganụ.